MISA KRIZIM
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
MISA KRIZIM
ABỤMỤKỌCHUKWU KRISTI NA AGBAMODIBỌ NDỊ ỤKỌCHUKWU
V. Onyenweanyị nọyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Site na ntémúdé nke Mmụọ Nsọ
I mere sọ otu Nwa Gị nnukwu Ụkọchukwu
nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebighịebi.
N'obiọma Gị pụrụ iche,
Ọ masịkwara Gị ime ka Ụkọchukwu Ya
dịgide n'ime Nzukọ.
N'ihi na ọ bụghị naanị na O bugoro ndị Ọ gbatara agbata
n'ọnọdụ ịbụ Ụkọchukwu nọ n'ọkwaeze,
kama O sitekwara n'obinwanne O nwere
si n'etiti ha họpụta ndị ga-eketa oke
n'ịgba odibọ nke Ya dị nsọ site na mbikwasị aka n'isi.
Ha ga-eji Aha Ya na-achụnwokwa
otu aja nke mgbapụta mmadụ
mgbe ha na-akwadoro ụmụ Gị oriri nke Ngafere,
jirikwa ịhụnanya na-edo ndị nke Gị nsọ,
were okwu na-azụ ha nri,
were àmànsọ ga na-edo ha ike.
Ka ọ ga-abụ, ha were ndụ ha nye maka Gi
na maka nzọpụta ụmụnne ha,
ha ana-agba mbọ ịdị n'ụdị Kristi n'onwwe Ya;
na-egosikwa gị nkwụdosie ike na ịhụnanya mgbe niile.
N'ihi nke a, O Dinwenụ,
anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Nsọ niile
na-ekwupụta Aha Gị, were ọñụ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...