NTỌALA NA AKAEBE NKE NDỊ APỌSTỤL
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ APỌSTỤL II
NTỌALA NA AKAEBE NKE NDỊ APỌSTỤL
A na-ekpe nke a na Misa nke Ndị Apọstụl na nke ndị dere Oziọma.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na I hiwere Nzụkọ Gị n'elu ntọala Ndị Apọstụl,
ka Ọ bụgide akara dị ebighịebi nke ịdịnsọ Gị n'ime ụwa,
ma nyekwa mmadụ niile ozi si n'eluigwe.
N'ihi nke a,
ugbua ruo mgbe ebighịebi,
anyị na-eso igweagha niile nke ndị Mmụọọma,
were mmụọ ofufe na-ekwe ukwe otito, na-etiku Gị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...