NDỊNSỌ E GBURU MAKA OKWUKWE II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊNSỌ E GBURU MAKA OKWUKWE II
IMERIME ỌRỤ ỊTỤNANYA CHUKWU N'IME MMERI NDỊ E GBURU
MAKA OKWUKWE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị, na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
N'ihi na ito Ndịnsọ Gị bụ ịja Gị mma.
Ihe ọbụla metụtara ahụhụ na ọnwụ ha
bụkwa ọrụ ịtụnanya nke ike Gị.
Gị, Onye ji ebere enye ụdị okwukwe a anụmọkụ,
Gị, Onye na-enye ume ntachiobi,
Gị, Onye na-agbasapụ aka enye mmeri n'ime nlega,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi nke a,
ihe niile dị n'eluigwe na n'ụwa,
jikọrọ ọnụ were ukwe ọhụrụ na-esekpuru Gị.
Anyị onwe anyị na igweagha ndị Mmụọọma niile,
sokwa na-ekwupụta otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...