VEJIN MARỊA DỊ NGỌZI II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
VEJIN MARỊA DỊ NGỌZI II
NZUKỌ JI OKWU MARỊA AJA CHINEKE MMA
A na-ekpe nke a na Misa Vejin Marịa dị Ngọzi.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị, ikwupụta na Ị dị ebube
n'ime ugwu na nsọpụrụ a na-enye ndị Nsọ niile,
ma ọ kachasị, na mmemme ncheta
nke Vejin Marịa dị Ngọzi,
iji ukwe ọñụ ya dị ụtọ na-eto obiọma Gị.
N'ezie, I meerela ụwa niile nnukwu ihe;
Bịakwa mee ka afọọma nke ebere Gị
rute ndụdụgandụ niile,
mgbe, Ị na-elekwasa umeala odibonwaanyị Gị anya,
I sitere na ya nye anyị Isintọala mgbapụta mmadụ,
Nwa Gị, Jesu Kristi, Dinwenụ anyị.
Onye igwe agha ndị Mmụọọma si na Ya
na-esekpụrụ ebubeeze Gị,
ka ha nọ n'ihu Gị na-egori ebighịebi.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were oke ọñụ na-eto Gị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...