NDỊ NWỤRỤ ANWỤ V

MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ NWỤRỤ ANWỤ V
MBILITENỌNWỤ ANYỊ SÍTÉRÉ NA MMERI KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa maka ndị nwụrụ anwụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Ọ bụ ezie na ihe kwesiri anyị bụ mbibi,
mana, Ọ bụ ihụnanya na amara Gị
na mgbe anyị nwụrụ n'ihi njọ, Ọ
bụrụ na a gbapụta anyị site na mmeri Kristi,
a na-akpọchighata anyị na Ya azụ na ndụ.
N'ihi nke a,
Anyị bụ ndị nọ n'ụwa na-eso ike niile nke Eluigwe
na-egori oge niile,
were ọñụ na-etiku ebubeeze Gị akwụsịghi akwusị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...