ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ V
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ V
OKIKE
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịri anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Ọ bụ Gị mere ihe niile dị n'ụwa,
were hazie oge dị n'afọ ka ha na-esote ibe ha,
ma kpụọ mmadụ n'oyiyi Gị,
were ịdị ebube nke ihe niile tinye n'okpuru ya,
ka o were ike nlekọta I nyere ya
bụrụ nnaukwu ihe niile I kere eke,
bịa site n'ọrụaka Gị dị ịtụnanya,
na-eto Gị akwụsịghị akwụsị
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi nke a,
anyị na-eso ndị Mmụọọma niile na-eto Gị,
were mmemme obiụtọ na-eti mkpuọñụ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...