ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ V
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ V
LAZARỌS
A na-ekpe nke a na Sọndee a gụrụ ọzịọma banyere Lazarọs, ma ọbụghị nke a, e were Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge Ọpịpịa Ụbọchị Iri Anọ I maọbụ II.
V Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R Nọnyekwara mmụọ gị.
V Welite nụ obi ụnụ elu.
R Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Dị ka mmadụ ezie, O bere akwa
n'ihi ọnwụ enyi Ya nwoke bụ Lazarọs
mana dị ka Chineke dị ọkpụ,
O si n'ili kpọlite ya.
N'ihi ọmịiko O nwere n'ebe mmadụ nọ,
O ji iheomimi dị nsọ
na-eduba anyị na ndụ ọhụrụ.
Site na Ya,
Igweagha ndị Mmụọọma na-esekpuru ebubeeze Gị,
nọrọ n'ihu Gị na-enwe ọñụ dị ebighịebi.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were otu olu na-ekwe ukwe ọñụ, na-asị :
Nsọ,Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...