EMUME NGAFERE IV
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
EMUME NGAFERE IV
MWEGHACHI IHE NILE E KERE EKE N'ỌNỌDỤ MBỤ HA
SITE N'IHEOMIMI NKE NGAFERE
A na-ekpe nke a n'oge emume Ngafere.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrọ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-eto Gị, oge niile, O Oseburụwa.
Ma Ọ kachasị mkpa n'oge ugbua,
ịja Gị mma n'ụzọ ka di ebube,
mgbe Kristi, Onye bụ Ngafere anyị,
bụzị ihe e jiri chụ aja.
N'ihi na, ka e memilachara usoro ndụ ochie,
E mere ka ihe niile e kere eke dara ada dịkwa ọhụrụ,
Bịa mee ka ozuzuoke nke ndụ
Bịaghachiri anyị n'ime Kristi.
N'ihi nke a,
Ebe ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
ụwa dum na mmadụ niile na-egori,
Ike niile nke igwe na nke ndị Mmụọọma
na-ekwekwa ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...