NDỊ NWỤRỤ ANWỤ I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ NWỤRỤ ANWỤ I
NCHEKWUBE NKE MBILITENỌNWỤ N'IME KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa maka ndị nwụrụ anwụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị, na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Ọ bụ na Ya ka nchekwube mbilitenọnwụ dị ngozi
si chawapụta n'ebe anyị nọ.
Ka ndị na a ga-anwụrịrị na-ewute,
nweta ntasiobi site na nkwa ndụ anwụ anwụ dị n'ụwa ọzọ.
Maka ndị kwere na Gị, O Oseburụwa,
ndụ anaghị enwe njedebe, Ọ bụ mgbanwo ka a na-agbanwo ya.
Mgbe ụlọikwù ụwa a mebiri,
a na-akpọbata anyị n'ụlọ ọzọ nke dị ebighịebi n'eluigwe.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Isimmụọọma,
Ukpoeze na Ikeọchịchị,
Ha na kwa usuu igwe ndị agha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...