AHỤHỤỌNWỤ ONYENWEANYỊ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
AHỤHỤỌNWỤ ONYENWEANYỊ II
MMERI SITERE N'AHỤHỤỌNWỤ
A na-ekpe nke a na Mọdee,Tuzdee na Nwenezdee nke Izuụka di nsọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
Site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye a maara na ụbọchị ahụhụ na ọnwụ Ya na-enye nzọpụta,
na mbilitenọnwụ Ya dị otito, na-abịa nso ;
bụrụkwa na ụbọchị ndị ahụ
ka a na-emeri ngara nke onyeiro mgbe ochie,
na-echetakwa iheomimi nke mgbapụta anyị.
Site na Ya,
Igweagha ndị Mmụọọma na-esekpụrụ ebubeeze Gị,
nọrọ n'ihu Gị na-enwe ọñụ dị ebighịebi.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were otu olu na-eti mkpuọñụ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...