NRỌGO N'ELUIGWE ONYENWEANYỊ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NRỌGO N'ELUIGWE ONYENWEANYỊ II
IHEOMIMI NKE NRỌGO N'ELUIGWE
A na-ekpe nke a n'ụbọchị emume Nrogo n'eluigwe Onyenweanyị. E nwekwara ike ikpe ya bido n'ụbọchị ndị so Nrogo n'eluigwe nke Onyenweanyị wee rute na Satọdee tupu mmemme Pentịkọstụ, n'ime Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye mgbe O bilitechara n'ọnwụ,
gosịrį ndị ụmụazụ Ya Onwe Ya;
ka ha nọ na-ele Ya anya,
e buliri Ya n'eluigwe,
iji mee ka anyị bụrụ ndị ga-eketa oke
n'ịbụ Chukwu nke Ọ bụ.
N'ihi nke a,
ebe Ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
mmadụ niile nọ n'ụwa na-egori.
Igwe ndịagha nke igwe na ike niile nke ndị Mmụọọma,
na-ekwekwa ukwe otito Gị, akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
N'ụbọchị Nlago n'eluigwe Onyenweanyị, Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa Nke
Rom, a ga-ekpe Ekpere Mmekọrịta Anyị Na Ndị Nsọ nke aka ya dị ka o siri dị
n’ihuakwụkwọ…..