IDO EKWUAJA NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IDO EKWUAJA NSỌ
EKWUAJA N'ONWE YA BỤ KRISTI
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Ọ bụ Ya bụ Onye e mere ezi ụkọchukwu
na ezi ihe nchụaja,
O tiiri anyị iwu ka anyị na-eme n'akwụsịghị akwụsị, mmemme ncheta aja nke Ya onwe Ya chunyeere Gị,
n'ekwuaja nke obe.
Ọ bụ n'ihi nke a ka ndị nke Gị
ji hiwe ekwuaja nke a,
nke anyị ji ọñụ agọnyere Gị, O Dinwenụ.
N'ezie ebe a bụ ebe dị ebube,
ebe a na-ehunyere Gị oge niile
aja Kristi n'ụzọ dị omimi
na-enye Gị otito zuru oke
mgbapụta anyị ana-apụtakwa ihe.
Ebe a ka a na-akwado ochenri nke Dinwenụ,
nọrọkwa na ya were ahụ Kristi zụọ ụmụ Gị nri
e kpokọta ha ọnụ, ha abụrụ Nzukọ dị otu, dị Nsọ.
N'ebe a kwa ka ndị kwerenụ na-añụrụ Mmụọ Gị,
mmiri si na Kristi, Okwute nke Mmụọ, na-ehupụta.
Site na Ya ka ha onwe ha
ga-eji bụrụ aja dị nsọ, ekwuaja dị ndụ.
Dinwenụ, n'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị nsọ niile,
were ọñụ na-ekwupụta aha Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha…