NDỊVEJIN NA NDỊAGỌNYERECHUKWU DỊ NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊVEJIN NA NDỊAGỌNYERECHUKWU DỊ NSỌ
AKARA NDỤ A GỌNYERE CHUKWU
A na-ekpe nke a na Nnukwu Mmemme Pụrụ Iche na Nnukwu Mmemme ndị Vejin na ndị Agọnyerechukwu dị Nsọ. E nwekwara ike ikpe ya na Mmemme Ncheta ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
O tosịrị na anyị ga-eme mmemme
maka mmụọ nchepụrụ Gị dị ịtụnanya na ndụ Ndịnsọ,
ndị gọnyeere Kristi onwe ha n'ihi alaeze eluigwe.
Site na mmụọ nchepụrụ Gị a,
Ị na-akpọghachi mmadụ n'ịdị nsọ nke o nweburu na mbụ,
na-edukwa ya ka ọ mata onyinye
nke a ga-enwetarịrị n'ụwa na-abịanụ.
N'ihi nke a,
anyị na-eso Ndịnsọ na ndị Mmụọọma niile,
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...