N'ỌMỤMỤ JỌN DỊ NSỌ OMEMMIRICHUKWU
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
N'ỌMỤMỤ JỌN DỊ NSỌ OMEMMIRICHUKWU
(JUUN 24)
NZUBE NZIPỤ OBUỤZỌ
(De missione Praecursoris)
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Anyị na-eto ịdịukwu Gị
n'ime Obuụzọ Kristi bụ Jọn dị Ngọzị
Onye I ji ugwu pụrụ iche doo nsọ
n'etiti ndị niile nwaanyị mụrụ.
O wetara nnukwu ọñụ site n'ọmụmụ ya.
ka a mụbeghịrịị ya,
o ji oke ọñụ wụlie elu n'ọbịbịa nzọpụta mmadụ.
N'ime ndị amụma niile, naanị ya onwe ya
bụ onye tụrụ Nwaatụrụ nke mgbapụta aka.
O ji osimiri a ga-edo nsọ
Wụchaa Isintọala mmirichukwu na Onwe Ya,
O bịa site na nkwafuọbara ya,
tozuo igbara Ya akaebe kachanụ.
N'ihi nke a,
Anyị bụ ndị nọ n'ụwa na-eso Ike niile nke Eluigwe
na-ekwupụta otito Gị,
na-etiku ebubeeze Gị ebighịebi,na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...