NDỊ APỌSTỤL PITA NA PỌL DỊ NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
NDỊ APỌSTỤL PITA NA PỌL DỊ NSỌ
(JUUN 29)
NZUBE NZIPỤ GBARA MKPỊ NKE PITA NA PỌL N'IME NZUKỌ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
N'ihi na Pita na Pọl, Ndịapọstụl Gị dị ngọzị
na-enye anyị obi añụrị site na nhazi nke Gị.
Pita bụ onye mbụ na nkwupụta okwukwe,
Pọl bụrụ onye kwụpụtara iche
n'ime ka aghọta ya nke ọma.
Pita jiri ndị fọdụrụnụ n'ime ụmụ Izrel
wube Nzukọ mbụ.
Pọl bụrụkwa nnaukwu na onye nkụzi nke okwukwe
maka ndị mba ọzọ ga, a ga-akpọbatarịrị.
Ha si etu a, site n'ụzọ dị icheiche,
Kpokọba otu ezinaụlọ Kristi.
A na-asọpụkọrọ ha ọnụ n'ụwa,
ha ketakwa otu oke n'ịnwụrụ Kristi.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndi Nsọ na ndị Mmụọọma niile
na-eto Gị akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...