EMUME NGAFERE III
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
EMUME NGAFERE III
KRISTI DỊ NDỤ NA-ARỊỌTARA ANYỊ ARỊRỊỌ OGE NIILE
A na-ekpe nke a n'oge Emume Ngafere.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-eto Gị, oge niile, O Oseburụwa.
Ma ọ kachasị mkpa n'oge ugbua,
ịja Gị mma n'ụzọ ka dị ebube,
mgbe Kristi, Onye bụ Ngafere anyị,
bụzi ihe e jiri chụ aja.
Onye anaghị akwụsị iji Onwe Ya achụ aja maka anyị,
Nọrọkwa oge niile na-echekwaba anyị,
na-ekwuchitekwara anyị n'ihu Gị ;
Onye e jirila chụ aja ma Ọ gaghị anwụ ọzọ,
n'agbanyeghị na e gburu Ya egbu,
Ọ dịzi ndụ mgbe niile.
N'ihi nke a,
ebe ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
ụwa dum na mmadụ niile na-egori,
Ike niile nke igwe na nke ndị Mmụọọma
na-ekwekwa ukwe otito Gị ebighịebi na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha…