EMUME NGAFERE II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
EMUME NGAFERE II
NDỤ ỌHỤRỤ N'IME KRISTI
A na-ekpe nke a n'oge emume Ngafere.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-eto Gị, oge niile, O Oseburụwa.
Ma Ọ kachasị mkpa n'oge ugbua,
ija Gị mma n'ụzọ ka dị ebube,
mgbe Kristi, Onye bụ Ngafere anyị,
bụzi ihe e jiri chụ aja.
Site na Ya ka ụmụ nke ìhè
ji bụrụ ndị a mụnyere na ndụ ebighịebi.
E wee kwaghepụkwara ndị kwerenụ
Ọnụụzọ nke alaeze eluigwe.
N'ihi na ọnwụ Ya agbapụtala ọnwụ nke anyị,
site na mbilitenọnwụ Ya, ndụ mmadụ niile ekulitela.
N'ihi nke a,
ebe ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
ụwa dum na mmadụ niile na-egori,
Ike niile nke igwe na nke ndị Mmụọọma
na-ekwekwa ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...