NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
JOSEF DỊ NSỌ
NZUBE NZIPỤ JOSEF DỊ NSỌ
Ana-ekpe nke a ụbọchị Nnukwu Mmemme pụrụ iche nke Josef dị nsọ, dị Marịa (Maachị.19), na mmemme ncheta nke Josef dị nsọ, onye ọrụ (Mee 1).
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
n'oriri Nnukwu Mmemme Pụrụ Iche
(ncheta) nke Josef dị ngọzị
I ji otito kwesịrị ekwesị were na-eto,
na-aja Gị mma ma na-ekwupụta Gị.
Ọ bụ nwoke onye eziomume I nyere
Vejin Nne nke Chukwu ka Ọ bụrụ Di Ya,
Bụrụkwa nwaodibọ kwesịrị ntụkwasịobi, anya ruru ala,
I mere ka Ọ bụrụ isi Ezinaụlọ Gị,
ka O nwee ike na-echekwaba dịka nna,
sọ otu Nwa Gị a tụrụ ime Ya site n'ike nke Mmụọ Nsọ,
Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Onye ndị Mmụọọma si na Ya na-eto ebubeeze Gị,
Ikeọchịchị na-esekpuru Gị, Ike niile na-ama jijiji n’ihu Gị,
Ígwē na ike niile nke igwe na kwa ndị Serafịm dị ngọzi,
jikọtara aka ọnụ na mmemme oke ọñụ na-eto Gị.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were umeala na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Onye ndi Mmuooma si na Ya na-eto ebubeeze Gi,
Ígwē na ike niile nke igwe na kwa ndi Serafim di ngozi,
Anyį na-ario ka I kwe ka anyi tinyekoo olu anyi na nke ha,were umeala na-eto Gi na-asi:
Nso,Nso, Nso Oseburuwa Chineke nke igwe ndi agha...