NKE ODIDO NSỌ ỤLỌNZUKỌ NA EKWUAJA
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NKE ODIDO NSỌ ỤLỌNZUKỌ NA EKWUAJA
IHEOMIMI ỤLỌNSỌ CHINEKE, NKE BỤ NZỤKỌ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na, n'ụlọ nke a a na-ahụ anya
I nyere anyị ka anyị wuo,
ebe Ị naghị ahapụ ịkpachapụrụ
ezinaụlọ Gị na-abịakwute Gị anya :
Ị na-egosi ma na-arụpụtakwa n'ụzọ dị ịtụnanya
ihe omimi mmekọrịta anyị na Gị.
Ebe a ka Ị na-ewuru onwe Gị ụlọnsọ ahụ
nke anyị onwe anyị bụ,
na-emekwa ka Nzụkọ Gị gbasara ụwa niile
na-abawanye Ahụ Dinwenụ, nke anyị ga-ahụ n'uju,
n'obodo Jerusalem nke eluigwe.
N'ihi nke a, anyị na-eso igwe òtù ndị dị ngọzị
na-aja Gị mma n'ụlọnsọ otito Gị
na-agọzi ma na-ebulikwa Gị elu, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...