ALỤMDINANWUNYE NDỊ OTU KRISTI I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ALỤMDINANWUNYE NDỊ OTU KRISTI I
UGWU DỊ N'AGBAMNDỤ DI NA NWUNYE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
I ji agbụụtọ nke otu obi
na ụdọ na-enweghị ndọbi nke udo
wee kekọọ agbamndụ di na nwunye,
ka adịmọcha na ọmụmụ nke di na nwunye dị asọ
bawanye ọnọọgụ ndị I ga-eme ka ha bụrụ ụmụ.
Site na mmụọ nchepụrụ na amara Gị dị ịtụnanya,
O Dinwenụ,
n'ọtụtụ ụzọ dị ịtụnanya,
Ị na-eme ka ọmụmụ bụrụ ihe na-achọ ụwa mma,
Mmụnwo nke mmirichukwu
abụrụ ihe na-eweta mbawanye n'ime Nzukọ Gị,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
site na ya, anyị na ndị Mmụọọma
na ndị nsọ niile
na-ekwe ukwe otito Gị akwụsịghị akwụsị na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...