MARỊA DỊ NGỌZỊ, NNE NKE CHUKWU
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
MARỊA DỊ NGỌZỊ, NNE NKE CHUKWU
(JEN.1)
ABỤM NNE NKE VEJIN MARỊA DỊ NGỌZI
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
O kwesịkwara na anyị ga-aja Gị mma,
Gọzie Gi, kwuwapụta ọrụọma Gị
na mmemme Abụmnne nke Marịa dị Ngọzi, Vejin Ọkpụ.
Onye si na mkpudo nke Mmụọ Nsọ
wee tụrụ ime nke sọ otu Nwa Gị,
ma nọgide n'ebube dị ọkpụ nke Abụmvejin ya,
wee wetakwara ụwa ihè dị ebighịebi,
Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Onye ndị Mmụọọma si na Ya na-eto ebubeeze Gị,
Ikeọchịchị na-esekpuru Gị, Ike niile na-ama jijiji n'ihu Gị.
Ígwẽ na igwendịagha nke igwe na kwa Serafịm dị ngọzi,
Jikọtara aka ọnụ na mmemme oke ọñụ na-eto Gị.
Anyi na-arịọ
ka I kwe ka anyị tinyekwuo olu anyị na nke ha,
were umeala na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...