MAKA NDỊNOOTU NDỊ OTU KRISTI
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
MAKA NDỊNOOTU NDỊ OTU KRISTI
NDỊNOOTU AHỤ KRISTI NKE BỤ NZỤKỌ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
Site na Kristi Dinwenụ anyị.
Site na Ya, I dubatala anyị n'ịmata eziokwu Gị
ka anyị wee site n'agbụ otu okwukwe
na otu mmirichukwu bụrụ ndị e mere ahụ Ya.
Sitekwa na Ya, Ị na-enye mba niile Mmụọ Nsọ Gị n'uju
Onye na-ebinyere ndị I ji mere ụmụ,
Onye, na-arụ ọrụ dị ịtụnanya n'ụbara onyinye dị icheiche,
Onye njikọ, ji ndị e jiri mere ụmụ mere ebe obibi,
Bịakwa jupụta, na-achịkwa izugbe Nzukọ.
N'ihi nke a,
Anyị ji ọñụ soro otuukwe ndị Mmụọọma
na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...