ATỌNOTU KACHASỊ NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
ATỌNOTU KACHASỊ NSỌ
IHEOMIMI NKE ATỌNOTU KACHASỊ NSỌ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
Gị na Nwa Gị a mụrụ naanị Ya na Mmụọ Nsọ
bụ otu Chineke, bụrụkwa otu Dinwenụ :
Ọ bụghi n'ịbu otu nke onweonye
kama ọ bụ n'atọnotu nke otu ọdịdị.
N'ihi na ihe ọbụla anyị sitere na Ngosipụta Gị
kwere banyere ebube Gị,
otu ihe ahụ ka anyị kwenyekwara banyere Nwa Gị
kwerekwa banyere Mmụọ Nsọ n'enweghị ngụbọsi ọbụla.
Ka ọ ga-abụ, a na-ekwupụta ezi Chukwu dị ebighịebi,
a na-esekpuru njirimara nke onye ọbụla n'ime Ha
na-esekpukwara ịbụotu n'ọdịdị ha
Na nhatanha n'ịdị ebube nke Ha
Onye ndị Mmụọọma na ndị Isimmụọọma na-eto,
Kerubim na Serafim nọkwa na-eto ụbọchi niile
jiri otu olu na-etiku akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...