ALỤMDINANWUNYE NDỊ OTU KRISTI III
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ALỤMDINANWUNYE NDỊ OTU KRISTI III
ALỤMDINANWUNYE DỊ KA AKARA ỤDỊ ỊHỤNANYA CHUKWU
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Ọ masịrị Gị, site n'onyinye nke ịhụnanya Gị,
ka mmadụ ekere e ke
bụrụ onye e bulitere n'ugwu dị oke elu,
nke na Ị hapụrụ ezi oyiyi ịhụnanya Gị
na mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
N'ihi na onyenụụ I kere n'ịhụnanya Gị,
Ị naghị ahapụ ịkpọghachi ya n'iwu ịhunanya Gị,
ka I wee mee ka o keta oke n'ịhụnanya Gị dị ebighịebi.
Iheomimi nke alụmdinanwunye dị nsọ
bụ akara Ịhụnanya Gị na-edo ịhụnaanya mmadụ nsọ
site na Kristi Dinwenụ anyị.
site na ya, anyị na-eso ndị Mmụọọma
na ndị nsọ niile na-ekwe ukwe otito Gị
akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...