IZUGBE II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IZUGBE II
NZỌPỤTA SITERE N'AKA KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha. E
nwekwara ike ikpe ya na Misa ndị Ọ na abụghị iwu na a ga-ekperịrị Mmalite Ekpere
Yukarịstịa nke oge emume.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, Ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
I kere mmadụ n'obiọma Gị.
mgbe a mara ya ikpe site n'ikpenkwụmọtọ,
Ị gbapụtara ya n'ihi ebere Gị,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Site na Ya ka ndị Mmụọọma ji eto ebubeeze Gị,
Ikeọchịchị na-esekpuru Gị,
Ike niile na-ama jijiji n'ihu Gị
Ígwē na Ike niile nke eluigwe na Serafịm dị ngọzi
Jikọrọ ọnụ na-eto Gi.
Anyị na-ariọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were umeala na-eto Gị na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...