Jeremaia
Usoro Nke Iri Atọ na Asatọ
Jeremaya nʼime olulu mmiri
1Shefataya nwa Matan, na Gedaliya nwa Pashua, na Jehukal ▼ nwa Shelemaya, na Pashua, nwa Malkija, nụrụ mgbe Jeremaya nọ na-agwa ndị mmadụ okwu ndị a sị ha, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’ 3Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”
4Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”
5Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.”
6Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.
7Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, 8Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya, 9“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”
10Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”
11Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. 12Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya. 13Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche.
14Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.”
15Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.”
16Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka Onyenwe anyị onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.”
17Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ. 18Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”
19Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”
20“Ha agaghị enyefe gị nʼaka ha,” ka Jeremaya zara ya. “Rubere Onyenwe anyị isi, site nʼime ihe m gwara gị. Mgbe ahụ, ihe niile ga-agara gị nke ọma. A ga-echebekwa ndụ gị. 21Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ: 22A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị,
“ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị,
mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri.
Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị,
ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’
23“A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.”
24Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ. 25Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’ 26mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ”
27Ndịisi ọchịchị ahụ niile bịakwutere Jeremaya jụọ ya ajụjụ. Ọ gwakwara ha ihe ahụ niile eze nyere ya nʼiwu. Ha hapụrụ ịjụ ya ihe ọzọ, nʼihi o nwekwaghị onye ọzọ nụrụ okwu niile ya na eze kwuru.
28Jeremaya nọgidekwara nʼogige ndị nche tutu ruo ụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.
Otu a ka esi were Jerusalem.