Jeremaia
Usoro Nke Iri Abụọ na Asatọ
Hananaya onye amụma ụgha
1O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m. 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn. 3Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn. 4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị 6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! ▼ Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn. 7Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a. 8Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche. 9Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”
10Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya. 11Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa.
12Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ▼ ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 13“Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe. 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ”
15Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha. 16Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ”
17Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.