Aisaia
Usoro Nke Iri Atọ na Asaa
Amụma banyere mgbapụta a gbapụtara Jerusalem
1Mgbe eze Hezekaya nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 2O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz. 3Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. 4Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
5Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya, 6ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m. 7Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”
8Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
9Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị, 10“Gwanụ Hezekaya, eze Juda: Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’ 11Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị? 12Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa? 13Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze ndị Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
14Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị. 15Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị: 16“O, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. 17Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
18“Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu, 19ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. 20Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.”
21Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa, 22nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya.
“Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn,
na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị,
Nwaada Jerusalem
na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ.
23Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?
Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị
welie olu okwu gị na anya gị elu megide?
Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?
24I sitere nʼaka ndị ozi gị
kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,
ị sịkwara,
‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m
rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,
nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.
Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,
na osisi junipa ya niile kachasị mma.
Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu,
bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
25Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,
ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.
Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee
ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’
26“Ọ bụ na ị nụbeghị?
Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.
Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya,
ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,
na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,
ghọọ mkpokọta nkume.
27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi,
na ome na-epupụta epupụta,
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị,
marakwa oke iwe gị megide m.
29Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko ▼ m nʼimi gị,
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị,
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.
30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama ▼ nye gị, Hezekaya.
“Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi,
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
32Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta,
otu ndị fọdụrụ ndụ ▼ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta.
Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-emezu nke a.
33“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa.
“Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a
maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a.
Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya,
maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;
ọ gaghị abanye nʼobodo a.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
35“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m,
na nʼihi Devid, bụ ohu m.”
36Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. 37Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
38Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.