Aisaia
Usoro Nke Iri na Asatọ
Amụma e buru banyere Kush
1Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya, ▼
ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush. ▼
2Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri,
bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri.
Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ
gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ,
gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
3Unu niile bi nʼelu ụwa dum,
na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.
Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,
lee anya;
mgbe a fụrụ opi ike,
gee ntị.
4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,
“Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,
dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,
na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”
5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị,
mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata,
ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya,
ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.
6A ga-ahapụ ozu ndị agha ha
ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha.
Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ,
ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.
7Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche,
site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ,
site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
bụ mba ndị okwu na ụka, ▼ nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
A ga-eweta onyinye ▼ a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.