Aisaia
Usoro Nke Iri na Ise
Amụma e buru banyere Moab
1Amụma megide Moab:
Ar dị na Moab a laala nʼiyi,
a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.
Kia dị na Moab a laala nʼiyi,
a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. ▼
2Ndị niile bi na Dibọn
na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị
Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba.
Isi ha niile bụ isi nkwọcha,
afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.
3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi,
mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama.
Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa
na-ada nʼala.
4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa,
a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz.
Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa,
mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.
5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ▼
ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa
na Eglat Shelishiya.
Ha na-akwa akwa
dịka ha na-arịgo Luhit. c
Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim,
ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
6Mmiri Nimrim atachaala!
Ahịhịa akpọnwụọkwala;
ahịhịa ndụ niile agwụkwala
o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
7Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara
ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.
8Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile;
akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim;
abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.
9Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara,
ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn!
Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab ▼ gbapụrụ
tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.