Abù Ọma
Usoro Nke Otu Narị na Iri Atọ na Asaa
Abụ ndị a dọtara nʼagha
1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa
mgbe anyị chetara Zayọn.
2Ọ bụ nʼosisi pọpla
ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,
ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;
ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya.
6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. ▼
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,
ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị
nʼihi ihe i mere anyị,
9onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara
tụpịa ha nʼelu nkume. ▼