Abù Ọma
Usoro Nke Otu Narị na Iri Atọ na Anọ
Abụ nrigo. Toonu Onyenwe anyị
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile
ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị.
2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya a
ma toonu Onyenwe anyị.
3Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa
site na Zayọn gọzie unu.