Abù Ọma
Usoro Nke Otu Narị na Iri Atọ na Otu
Abụ nrigo, nke Devid. Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi
1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,
ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;
adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m
maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;
dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,
e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị a
ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.