Abù Ọma
Usoro Nke Otu Narị na Iri na Asaa
Too ya nʼihi ịhụnanya ya
1Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche.
Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche.
2Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu.
Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.
Toonu Onyenwe anyị!