Abù Ọma
Usoro Nke Iri Asatọ na Ise
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora. Ekpere maka ihuọma
1 O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma;
i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.
2 I gbagharala ajọ omume ndị gị,
kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela
3 Ị kwụsịla iwe oke iwe gị,
I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
4 Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.
5 Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe:
Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?
6 Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ
ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?
7 O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,
nyekwa anyị nzọpụta gị.
8 Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;
ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,
ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.
9 Nʼezie, nzọpụta ya dị nso a ndị na-atụ egwu ya,
ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
10 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;
ezi omume na udo esutula ọnụ.
11 Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,
ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
12 Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma,
ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.
13 Ezi omume ga-aga nʼihu ya,
idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.