Abù Ọma
Usoro Nke Iri Ise na Otu
Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. Ekpere maka mgbaghara mmehie
1 O Chineke, meere m ebere,
nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide;
nʼihi oke ọmịiko gị,
hichapụ njehie m niile.
2 Sachapụ mmehie m niile, ▼
ma mee m ka m dị ọcha.
3 Nʼihi na amaara m njehie m niile,
mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,
mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,
nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,
na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;
bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo;
ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
7 Were hisọp ▼ sachaa m, aga m adị ọcha;
sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;
ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,
hichapụkwa mmehie m niile.
10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,
nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
11 Achụpụla m nʼihu gị,
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị,
ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara,
Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m,
ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m,
ka m kwupụta otuto gị.
16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya.
Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,
O Chineke, ị naghị elefu anya,
nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu;
i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja,
aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ;
mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.