Abù Ọma
Usoro Nke Iri Anọ na Isii
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị
1 Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela
4 Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,
nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
5 Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
6 Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;
o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
7 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela
8 Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,
lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
9 Ọ na-eme ka agha kwụsị
ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.
Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,
ma na-esu ọta ▼ agha niile ọkụ.
10 Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
11 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela