Abù Ọma
Usoro Nke Iri Anọ na Abụọ
Nchịkọta Akwụkwọ nke Abụọ Abụ Ọma 42–72 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Iru ụjụ na nkasiobi onye ezi omume
1 Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.
2 Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.
Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?
3 Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri
nʼehihie ma nʼabalị,
mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,
“Olee ebe Chineke gị nọ?”
4 Ihe ndị a ka m na-echeta
mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:
ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,
mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha
nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,
na-aga nʼụlọ Chineke.
5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya,
Onye nzọpụta m na Chineke m.
6 Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;
ya mere, aga m echeta gị
site nʼala Jọdan,
na ebe dị elu nke Hemon, ▼ na sitekwa nʼugwu Miza.
7 Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri
mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;
ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile
ekpuchiela isi m.
8 Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,
nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,
ekpere nye Chineke nke ndụ m.
9 Ana m asị Chineke, oke nkume m,
“Gịnị mere i ji chefuo m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ
nʼihi mmegbu nke onye iro?”
10 Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,
mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,
ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,
“Olee ebe Chineke gị nọ?”
11 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
Onye nzọpụta m na Chineke m.