Abù Ọma
Usoro Nke Iri Abụọ na Itoolu
Abụ Ọma Devid. Olu Onyenwe anyị
1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
2 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
3 Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;
olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,
olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe ▼ nʼelu oke osimiri.
4 Olu Onyenwe anyị dị ike,
olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
5 Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
6 Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,
ọ na-eme ka Siriọn ▼ wulie elu dịka nwa atụ.
7 Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe
mgbe amụma na-egbu.
8 Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
9 Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ ▼
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;
Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,
ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.