Abù Ọma
Usoro Nke Iri Abụọ na Atọ
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ
1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3 ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya.
4 A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
5 Ị na-akwado tebul ▼ nʼihu m,
nʼanya ndị iro m.
I tere isi m mmanụ ▼
iko m na-ejubiga oke.
6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị
mgbe niile ebighị ebi.