Abù Ọma
Usoro Nke Iri na Isii
Abụ miktam nke Devid. Ekpere maka iguzosi ike
1 Chebe m, O Chineke,
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
2 A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m,
e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
3Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,
“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.
Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara ▼ nye chi ndị a,
maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ▼
ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;
nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;
ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;
aga m anọkwa nʼudo.
10 Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi ▼ hụ ire ure.
11 I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.