1 Ndi-Eze
Usoro Nke Itoolu
Onyenwe anyị emee ka Solomọn hụ ya anya
1Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime, 2Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn. ▼ 3Onyenwe anyị sịrị ya,
“Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.4“Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile, 5mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
6“Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha, 7mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile. 8Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’ 9Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
10Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze. 11Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya. 12Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya. 13Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, ▼ aha ọ na-aza ruo taa. 14Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
15Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza. 16Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ. 17Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon, 18Baalat na Tadmọ ▼ nke dị nʼọzara nʼime ala ya. 19O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
20Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel), 21ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa. 22Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya. 23Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise (550), ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.
24Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.
25Ugboro atọ nʼafọ, ▼ ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
26Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, ▼ bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm. 27Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a. 28Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, ▼ site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.