1 Kọrint
Usoro Nke Asatọ
Anụ e ji chụọrọ arụsị aja
1 Ugbu a, nʼokwu banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị ma na onye ọbụla nwere amamihe. Amamihe na-afụli mmadụ elu mee ka ọ nyaa isi. Ma ịhụnanya na-ewuli elu. 2 Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe niile, onye ahụ amatabeghị ihe o kwesiri ịmata. 3 Ma onye ahụ hụrụ Chineke nʼanya bụ onye ọ maara.
4 Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.” 5 A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nʼeluigwe maọbụ nʼụwa (nʼezie ọtụtụ “chi” na “ndị nwe mmadụ” dị otu a dị). 6 Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
7 Ma otu ọ dị, ọ bụghị onye ọbụla nwere ihe ọmụma a. Ụfọdụ nʼime ndụ ha niile, ha na-ele arụsị anya dịka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọrọ aja. Nʼihi nke a, mgbe ọbụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nʼihi na akọnuche ha esighị ike, ọ na-emerụkwa ya. 8 Ma ọ bụghị nri ga-eme ka anyị na Chineke dị na mma. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe na-efunarị anyị.
9 Ma lezienụ anya, otu o si dị, ka ike unu nwere ime ihe ọbụla dị unu mma, ghara ịghọ ihe ịsọ ngọngọ dịrị ndị na-adịghị ike nʼokwukwe ha. 10 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị? 11 Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi. 12 Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike. 13 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.