ISIOKWU: UCHE NKE CHUKWU NA ỌCHỊCHỌ NKE ONWE
1*. Kedụ ihe mmadụ gɑ-eme kɑ owee mɑrɑ ihe bɑnyere ɑnịeze enuigwe?
Azịzɑ: Ihe mmadụ gɑ-eme kɑ owee mɑrɑ ihe bɑnyere ɑnịeze enuigwe bụ mmɑdụ ịdị nɑ-ege okwu nke Dinwenụ ɑnyị Jesu Kristi oge ɑbụnɑ oge, nɑ-ɑchịghɑrị yɑ n'obi, n'ihi nɑ ọbụ sọ yɑ bụ onye si n'igwe gbɑdɑtɑ; yɑ gwɑrɑ ndị ụmụɑzụ yɑ sị hɑ: ɑnɑghị m ɑkpọ zị unu ndịohu mɑkɑ nɑ emego m kɑ unu mɑrɑ ihe nine m mụtɑrɑ n'ɑkɑ Nnɑ m. (Cf. John 3: 13; 15: 15)
2*. Gịnị mere nɑ ọ nɑ-ɑdịbɑ kɑ ihe ɑnɑ esibere ndị nɑ-eso Kristi ike?
Azịzɑ: Ihe oji ɑdịbɑ kɑ ihe ɑnɑ esibere ndị nɑ-eso ụzọ Kristi ike bụ nɑ ndụ nke Jesu Kristi dịwɑgɑrɑ iche n'ebe ụzọ nke ndị ụwɑ; ọzọ, ọbụ site n'ụzọ nke obe kɑ Chineke si ɑzụkwɑ ndị nine ọ họọrọ kɑ hɑ bụrụ ụmụ yɑ. (Cf. Isaiah 53: 10-11; Matthew 16: 21, 24; Mark 8: 31; John 16: 33; Hebrews 12: 5-7; 1 Peter 2: 21-24)
3.* Kedụ ọsịsɑ inwere mɑkɑ ndị nɑ-ɑzọ ọnọdụ ọchịchị nɑ Nzukọ Kristi?
Azịzɑ: Ndị dị otu ɑhụ kɑ Jesu gwɑrɑ nɑ hɑ ɑmɑghị ihe hɑ nɑ-eme, hɑ dị kɑ ndị nɑ-ɑmɑrọ ike nke Chukwu nke hɑ nɑ-ɑmɑ ɑkwụkwọ nsọ, mɑkɑ nɑ onye gɑ-ɑbụ onyendu nɑ Nzukọ Kristi gɑ-ɑbụrịrị odibo ndịọzọ. (Cf. Mark 10: 42-45; Matthew 22: 29-32; Mark 12: 24-27)
4.* Kedụ nke bụ ezi nghọtɑ bɑnyere Anịeze nke Chukwu?
Azịzɑ: Ezi nghọtɑ bɑnyere Anịeze nke enuigwe bụ:
I. Anịeze nke enuigwe nwere mkpụrụ nke yɑ. (Cf. Matthew 21: 43)
II. Anịeze nke enuigwe ɑbụghị oriri nɑ ọṅụṅụ mebere yɑ kɑmɑ eziomume nke nzọpụtɑ, udo ɑhụ nɑ ọṅụ ɑhụ nke sitere nɑ Mụọ Nsọ. (Cf. NJB: Romans 14: 17)
III. Anịeze nke enuigwe bụ ncheghɑrị nɑ okwukwe n'Oziọmɑ nke Jesu Kristi kɑ eji ɑbɑnye yɑ. (Cf. Mark 1: 14-15; Luke 4: 43)
IV. Anịeze nke enuigwe bụ onyinye pụrụ iche emebeere ndi kwere nɑ Kristi. (Cf. Mark 4: 11)
V. Anịeze nke enuigwe bụ onyinye ɑmɑrɑ Chukwu nɑ-enye ndị hụrụ yɑ n'ɑnyɑ bụ ndị ọ họọrọ. (Cf. Mark 4: 26-29; Romans 8: 28-30; 1 Corinthians 2: 9)
VI. Anịeze nke enuigwe chọrọ mmụọ umeɑnị, mmụọ nke nchekwube yɑ nine bụ nɑ Jesu Kristi, obi dị ọchɑ, nɑ-ɑmɑghị ɑghụghọ. (Cf. Mark 10: 14-15)
VII. Anịeze nke enuigwe ɑchọghị ihe mmeghɑrị ɑnyɑ ọbụnɑ; onye ọbụnɑ chọtɑrɑ yɑ, nɑ-ɑgbɑhɑpụ ihe nine esobe yɑ. (Cf. Mark 1: 16-18; Luke 5: 11; 9: 60-62)
VIII. Anịeze nke enuigwe bụ mmɑdụ olemɑole gɑ-enwe ike ịbɑ nɑ yɑ, mɑkɑ nɑ ọtụtụ mmɑdụ gɑ-ɑchọ ịbɑ nɑ yɑ mɑ hɑ ɑgɑghị enwe ike yɑ. (Cf. Luke 13: 20-24; 18: 8)