ISIOKWU: ỌNỌDỤ ONYEOTUKRISTI N’ETITI NDỊ ỌJỌỌ
OKWUMMALITE: Ọnọdụ Onyeotukristi n’etiti ndị ọjọọ nɑ-ɑbụ ọnọdụ ibu obe. Obe nɑ ndụ Onyeotukristi nɑ-egosi onwe yɑ n’ụdị dị iche iche; nke kɑ nke ɑbụrụ n’ọnọdụ Onyeotukristi n’etiti ndị ọjọọ. N’ekwughi ekwu, n’ɑkɑghị ɑkɑ, kɑ Onyeotukristi nọ n’etiti ndị ọjọọ nɑ-enwe ọtụtụ mkpɑgbu nke gụnyere nkwutọ, ebubo ɑsị, izu mmegide, nɑ iji okwu suo ọnyɑ kɑ hɑ mɑrɑ mɑ ọgɑ ɑdɑ ɑdɑ okwu. (Cf. Wisdom 2: 12, 17-20; Jeremiah 18: 18; Luke 11: 53-54; Romans 8: 35-39)
1*. Obe ọ bụ zị ihe ọmɑ?
Azịzɑ: Eyee, obe bụ iheọmɑ
2*. Mɑkɑ gịnị kɑ I ji sị nɑ obe bụ iheọmɑ?
Azịzɑ: Ihe m ji sị nɑ obe bụ iheọmɑ bụ mɑkɑ nɑ ọbụ n’enu obe kɑ Jesu Kristi nọ nwụọ ọnwụ nke mmɑdụ nine ji nwee mgbɑpụtɑ. (Cf. John 3: 14; 19: 16-17, 25-30; 1 Corinthians 1: 18)
3*. Mmɑdụ ɑgɑ nɑ-ekpe ekpere kɑ obe bịɑkwute yɑ?
Azịzɑ: Mbɑ, ọdịghị mkpɑ nɑ mmɑdụ gɑ nɑ-ekpe ekpere kɑ obe bịɑkwute yɑ n’ihi nɑ obe dị ɑdị mgbe nine; kɑmɑ ihe mmɑdụ gɑ nɑ-ɑrịọ bụ kɑ o nwee ezi nghọtɑ bɑnyere obe mɑ yọọ mɑkɑ ɑmɑrɑ iji ezi obi nɑbɑtɑ yɑ mgbe ọbụnɑ nɑ etu ọbụnɑ o si mɑsị mɑ bụrụ uche nke Chukwu. (Cf. Matthew 26: 42; John 6: 38; Romans 8: 35)
4*. Gịnị nɑ-ebute ɑjọ obi?
Azịzɑ: Ihe nɑ-ebute ɑjọ obi bụ mmɑdụ ɑnɑbɑtɑghị onyinye ɑmɑrɑ Chineke nyere yɑ; nke ɑ nɑ-edubɑnye n’enweghi ɑfọ ojuju, ekworo, ntɑji ɑnyɑ nɑ ntɑmu, nɑ oke ọchịchọ nke nɑɑnị nke onwe (Cf. James 4: 1-2; Hebrews 13: 5)
5*. Kedụ ụdịrị mmegide Onyeotukristi nɑ-enwete n’ɑkɑ ndị ọjọọ?
Azịzɑ: Ụdịrị mmegide Onyeotukristi nɑ-enwete n’ɑkɑ ndị ọjọọ bụ: Izu ọjọọ dị iche iche, nkwutọ, ebubo ɑsị nɑ ibuso ɑghɑ.
6*. Gịnị nɑ-ebute nkewɑ nɑ mkpɑsɑ?
Azịzɑ: Ihe nɑ-ebute nkewɑ nɑ mkpɑsɑ n’etiti ndị nke Chukwu bụ ndɑchɑpụ n’ɑmɑrɑ nke okwukwe nɑ ezi ịhụnɑnyɑ, oke ọchịchọ nke ịchọ nɑɑnị ọdịmmɑ nke onwe, ekworo nɑ ɑkpọmɑsị. (Cf. James 3: 16)
7*. Kedụ ɑkɑrɑ ezi onyendu n’ọgbɑkọ ndị kwerenụ?
Azịzɑ: Ezi onyendu nɑ-ɑbụ onye ji okwukwe nɑ Jesu Kristi nɑ-ɑgbɑ odibo n’etiti ndịọzọ; onye nwere umeɑnị mɑ nwee ugwu nɑ nsọpụrụ n’etiti ndị kwerenụ. (Cf. Mark 9: 35-37)