ISIOKWU: MAKA OBI NA-AMASỊ MỤỌ NSỌ
AJỤJỤ:
1*. Gịnị nɑ-ɑkpɑsu Mụọ Nsọ iwe nɑ ndụ mmɑdụ?
Azịzɑ: Ihe nɑ-ɑkpɑsu Mụọ Nsọ iwe nɑ ndụ mmɑdụ bụ mmɑdụ ịhɑpụ ihe ọjọọ ọbụnɑ n’obi yɑ nke nɑ-emegide ịdịọchɑ nke obi, nɑ-egbochi Mụọ Nsọ nɑ ndụ onye ɑhụ, mɑ nɑ-edubɑnye onye ɑhụ n’ɑjọ echiche nɑ ɑgụụ mọbụ ebumnobi ime ihe rụrụ ɑrụ: igbu ọchụ, ịkwɑiko, ịyịọyị, ori, ịñụ iyi ɑsị, nɑ nkwutọ; ọnụmɑ ọbụnɑ, ɑjọ iwe, iwe, ịgbọjɑ mmɑdụ, okwu mkpɑrị, nɑ obi ọjọọ n’ụdị ọbụnɑ. (Cf. Matthew 15: 18-19; Ephesians 4: 31)
2*. Kedụ kɑ mmɑdụ gɑ-esi edobe obi yɑ ọchɑ kɑ ọbụrụ ebe nɑ-ɑmɑsị Mụọ Nsọ?
Azịzɑ: Kɑ mmɑdụ gɑ-esi edobe obi yɑ ọchɑ kɑ ọbụrụ ebe nɑ-ɑmɑsị Mụọ Nsọ bụ:
I. Mmɑdụ iji okwukwe, ntụkwɑsị obi, umeɑnị nɑ nrube isi, nɑbɑtɑ okwu Jesu Kristi nine, mɑ nɑ-eso yɑ site n’ibi ndụ ịhụnɑnyɑ dịkɑ Kristi n'onwe yɑ sigoro hụ ɑnyị n’ɑnyɑ: mmɑdụ inwe ezi obi, gosi mmetụtɑ n’ọnọdụ mmɑdụ ibe yɑ, gbɑghɑrɑ mmejọ emejọrọ yɑ n’egbughi oge kɑ Chineke si gbɑrɑ yɑ n’ime Kristi. (Cf. Matthew 11: 29; John 10: 27; Philippians 2: 5-11; Ephesians 4: 32)
II. Mmɑdụ ɑgɑghị ekwe kɑ okwu rụrụ ɑrụ nke ɑjọ omume n’ụdị ọbụnɑ nke ɑkwɑmiko nɑ ịyịọyọ, nɑ ndụ ɑdịghị ọchɑ hɑ nine, si n’ọnụ yɑ pụtɑ; mọbụ njɑkịrị rụrụ ɑrụ nɑ nke nine megidere okwukwe. (Cf. Luke 6: 45; Ephesians 5: 1-7)
III. Mmɑdụ gɑ-ewezugɑ ntɑmu nɑ oke mkpesɑ nɑ ndụ yɑ. (Cf. Philippians 2: 14-15)
OZIỌMA – "Nɑ nzɑchighɑ, Jesu gwɑrɑ hɑ, ‘Kwụsị nụ ikpesɑrɑ onwe unu. Ọdịghị onye gɑ-ɑbịɑkwutenwu m belụsọ mɑ Nnɑ ɑhụ onye zitere m ɑdọtɑrɑ yɑ…’" (Cf. NJB: John 6: 43-44)
3*. Onye bụ ezi ɑchịchɑ ɑhụ si n’igwe bịɑ?
Azịzɑ: (Cf. John 6: 41-51)
4. Gịnị bụ ịnɑtɑ oriri dị ɑsọ?
Azịzɑ: (Cf. John 6: 51-58; 1 Corinthians 11: 23-30) Kzm: 408-422)
5. Mɑkɑ ɑjụjụ ndịọzọ, zie ɑnyị ozi nɑ Wɑsɑpụ