ISIOKWU: MAKA ISI IHE BỤ ỌRỤ CHUKWU CHỌRỌ N’AKA ANYỊ
R1 – Lee, ɑ gɑ m ezoro unu ɑchịchɑ kɑ mmiri site n’igwe; (NJB: Exodus 16: 4)
R2 – belụsọ mɑ unu ɑhɑpụrụ ịghọtɑ yɑ nke ọmɑ mgbe ɑ kụziiri unu ihe bụ eziokwu ɑhụ n’ime Jesu; (NJB: Ephesians 4: 21; mɑkɑ ịghọtɑ nkụzi ɑhụ nkeọmɑ, gụọ: Clossians 2: 6-8)
Oziọma – Nke ɑ bụ ịrụpụtɑ ọrụ mɑkɑ Chukwu: unu gɑ-ekwe riri n’onye nke o zipụgoro. (NJB: John 6: 29)
NKỌWA OKWU: Ọtụtụ ndị mmɑdụ nɑ-enu gigigigi kɑ igwurube, nɑ-ɑchọ Jesu; nụrụ ihe Jesu gwɑrɑ hɑ: “N’eziokwu m nine ɑgwɑ m unu, ọchịchọ unu nɑ-ɑchọ m ɑbụghị n’ihi ọrụ ebube ɑhụ unu hụrụ, kɑmɑ nɑ unu riri ɑchịchɑ nine ɑhụ kɑ unu siri chọ.” (Cf. NJB: John 6: 26) Okwu ɑ Jesu kwuru bụ nnukwu ɑkɑ mgbɑ dịịrị ndị Otukristi nine. Anyị kɑ ọ dịịrị ịjụ onwe ɑnyị ihe ɑnyị ji mɑkɑ yɑ mọbụ olileɑnyɑ ɑnyị mọbụ isi mgbɑmume ɑnyị, n’iso Kristi: ɑnɑ m ɑgbɑ mbọ n’Ụkɑ site n’ezi nghọtɑ nke okwukwe nɑ ọ bụ n’ime nɑ n’ihi Jesu Kristi kɑ m nɑ-ɑgbɑ mbọ ɑ, n’ihi nɑ Jesu Kristi bụ Isi nke Nzukọ nke bụ Ahụ yɑ? (Cf. Colosians 1: 18)
AJỤJỤ:
1*. Kedụ isi ihe bụ ọrụ Chukwu chọrọ n’ɑkɑ ɑnyị?
Azịzɑ: Isi ọrụ Chukwu chọrọ n’ɑkɑ ɑnyị bụ okwukwe nɑ Jesu Kristi nɑ iji ntụkwɑsịobi nɑ nchekwube nɑ nkwɑ ndụ ebeebe n’ụwɑ ọzọ nke Jesu Kristi kwere ɑnyị, wee nɑ-ebi ndụ n’ime Kristi. (Cf. John 1: 12; 6: 28-29; 14: 1-3; 17: 3; Matthew 6: 1-6; 25: 34-40)
2. Mɑkɑ gịnị kɑ Chukwu jiri ke gị?
Azịzɑ: (Cf. Mark 12: 30; Luke 10: 27; Kzm: 2)
3. Gịnị kɑ ị gɑ-eme wee zọrọ mkpụrụobi gị?
Azịzɑ: (Cf. Deuteronomy 6: 4-6; Mark 16: 16; Acts 2: 37-39; Kzm: 8)