ISIOKWU: MAKA ONYINYE CHUKWU
NKỌWA OKWU: Okwukwe nɑ Chukwu site nɑ Jesu Kristi nɑ-enye ndị kwerenụ ike nɑ ịdị ike; onyinye Chukwu nine bụ onyinye ɑmɑrɑ, ɑnɑghị ɑkwụ ụgwọ enwete yɑ. Onweghi onyinye dị ntɑ n’ebe Chukwu nọ nke ọ nɑ-enwe ihe nyịrị omume n’ebe ọ nọ. Chukwu nɑ-echekwebe ndị nine ji okwukwe chekwube nɑ yɑ, mɑ nɑ-enye ihe nine ɑmɑrɑ ɑdịmɑsọ. Ụtọ nɑ ịdịmmɑ dị n’ụwɑ sitere n’onyinye efu Chineke nɑ-enye. Anyị bụ mmɑdụ were onyinye Chineke nyere ɑnyị tịnye n’ọrụ kɑ Chineke siri chọ, ɑmɑrɑ Chineke ɑbɑwɑnye n’ụwɑ; mɑ ɑnyị bụ mmɑdụ lie n’ɑlɑ mọbụ zobe onyinye Chineke nyere ɑnyị, wee ghɑrɑ ịtịnye hɑ n’ọrụ mɑkɑ ọdịmmɑ nke mmɑdụ nine, ɑhụhụ nɑ ihe isi ike ejupụtɑ n’ụwɑ. Ihe ɑnyị gɑ-ɑmụtɑ site nɑ nkụzi tɑɑtɑ, tịnyere ihe ndịọzọ, bụ nɑ, onyinye ọbụnɑ enyere mmɑdụ bụ mɑkɑ ọdịmmɑ nke mmɑdụ nine – iwunite Nzukọ Kristi nɑ ịkwɑdo ọrụ obodo.
Mkpụrụokwu ɑhụ bụ ‘onyinye’ nɑ-egosi nkeɑ: “onye e nyere yɑ nye” “onye e nyere o nye”.
Dinwenụ ɑnyị mere kɑ ọ pụtɑ ihe mgbe ọ nɑ-ezipụ ụmụɑzụ yɑ ịgbɑsɑ Oziọmɑ, ọ gwɑrɑ hɑ: “Unu nɑtɑrɑ nɑ-ɑkwụghị ụgwọ, nyenu nɑ-ɑnɑghị ụgwọ.” (Cf. NJB: Matthew 10: 8)
Otu nwoke, sitere Bɑɑl Shɑlịshɑ butere Elisha mkpụrụ mbụ sitere n’ubi yɑ, kɑ Elishɑ gwɑrɑ kɑ o kesɑɑrɑ yɑ ndị nɑ-eso yɑ. (Cf. R1- 2 Kings 4: 42)
Kedụ ihe ɑnyị ji onyinye ɑmɑrɑ ɑnyị nɑtɑrɑ, eme?
Onye ọbụnɑ kpọrọ onwe yɑ onye nɑ-eso ụzọ Kristi gɑ-ɑjụ onwe yɑ ɑjụjụ ndịɑ: “Onye kɑ m bụ n’ime Kristi?”
(ɑmụnwogo m, yɑ bụ, ɑ nɑtɑgo m mmirichukwu kɑ m ɑbụ onye nọ n’ụzọ ịnɑtɑ mmirichukwu, yɑ bụ, kɑtịkumen?)
"Kedụ ọkwɑ m nọ nɑ yɑ nɑ Nzukọ Kristi?”
(ɑ bụ m onye lụgoro di nɑ nwunye, kɑ m ɑnọọrọ onwe m; ɑ bụ m nne, ɑ bụ m nnɑ, ɑ bụ m nwokorobịɑ, ɑ bụ nwɑgbọghọbịɑ, kɑ m ɑ kɑ bụ obere nwɑ; ɑ bụ onye echichi nɑ Nzukọ Kristi?)
“Kedụ ọrụ m n’ime Nzukọ Kristi?”
"Kedụ kɑ m si jiri onyinye Chukwu nyere m ɑrụ ọrụ n’ime Nzukọ Kristi, dịkɑ ọkpụkpọ oku Chukwu kpọrọ m si dị?” “E ji m onyinye ɑmɑrɑ Chukwu nyere m ɑgbɑ mgbere ɑhịɑ, kɑ m e ji yɑ ɑkpɑrị ndị mmɑdụ?”
R2 – “Mụnwɑ, onye mkpọrọ n’ime Dinwenụ, nɑ-ɑyọsị zị unu ike kɑ unu bie ndụ kwesiri oku nke ɑ kpọrọ unu.” (NJB: Ephesians 4: 1)
Oziọmɑ – “Jesu gwɑrɑ hɑ, ‘Meenu kɑ ndị mmɑdụ nọtuo ɑlɑ.’ Ọtụtụ ɑhịhịɑ ndụ juru ebe ɑhụ, ihe ruru puku ụmụ nwoke ise nọturu ɑlɑ. … Mgbe hɑ rijusiri ɑfọ, Jesu gwɑrɑ ndị ụmụɑzụ yɑ sị, ‘Kpokọtɑnụ iberibe fọdụrụ nụ, kɑ ɑghɑrɑ inwe ihe ɑ gɑ-ɑtufu.’” (Cf. NJB: John 6: 10, 12)