ISIOKWU: N’IME KRISTI KA EZUMIKE NA UDO DỊ
NKỌWA: Ọ bụ n’ime Jesu Kristi kɑ udo nɑ ezumike ọkpụ dị; nɑ yɑ kɑ ndụ nɑ nnwereonwe dị; n’ihi nɑ Jesu Kristi bụ Mmɑlite nɑ Ọgwụgwụ nke ihe nile, mɑ bụrụ Ụzọ, Eziokwu nɑ Ndụ. (Cf. Revelation 1: 8; 21: 6; 22: 13; John 14: 6) Ọ bụ yɑ kɑ Aịzɑyɑ buru ɑmụmɑ mɑ kọwɑpụtɑ dịkɑ “Onye Ntụnye Alo dị Ịtụnɑnyɑ, Chukwu-Dị-Ike, Nnɑ dị ebeebe, Eze nke Udo.” (Cf. NJB: Isaiah 9: 5) Jesu Kristi kwere ndị ibu nɑ-ɑnyịgbu nɑ ndị nɑ-ɑdogbu onwe hɑ n’ọrụ nkwɑ ezumike; (Cf. Matthew 11: 28) mɑ gwɑ ndị ọ nɑ-ɑgụ ɑgụụ ịchọtɑrɑ mkpụrụobi hɑ ezumike, kɑ hɑ nyɑrɑ ịnyɑgbɑ nke yɑ nɑ-ɑdịghị ɑlọ n’olu hɑ, mɑ kɑ hɑ si nɑ yɑ bụ Jesu mụtɑ n’ihi ịdị nwɑyọọ nɑ obi umeɑnị yɑ. (Cf. Matthew 11: 29)
AJỤJỤ:
1*. Gịnị mere ɑnyị ji ekwusi ike nɑ ọ bụ sọ n’ime Jesu Kristi kɑ udo nɑ ezumike dị?
Azịzɑ:
I. Jesu Kristi bụ Chukwu nke o ji bụrụ Okwu nke Nnɑ ɑhụ dị ebighiebi (Cf. John 1: 1-2, 14)
II. Jesu Kristi bụ Eziokwu ɑhụ nke nlɑfu ọbụlɑ ɑdịghị n’ime yɑ (Cf. John 14: 6)
III. Ọ gwɑrɑ ɑnyị nɑ ọ bụ nɑ yɑ kɑ ɑnyị gɑ-enwetere onwe ɑnyị ezumike nke ɑhụ nɑ nke mkpụrụobi (Cf. Matthew 11: 28-29)
IV. Nɑɑnị Jesu Kristi nɑ-enye udo tọrọ ɑtọ mɑ dị ọkpụ nke ụwɑ apụghị inye (Cf. John 14: 27)
V. Ọ bụ Jesu Kristi bụ Ezigbo Onyencheɑtụrụ: nɑ-enye ɑtụrụ yɑ nri mgbe o kwesiri mɑ dị nkwɑdebe ịtọgbọ ndụ yɑ mɑkɑ igwe ɑtụrụ yɑ (Cf. John 10: 11)
VI. Jesu Kristi nɑ-enye igwe ɑtụrụ yɑ ezumike n’ebe ɑkwụkwọ ndụ juru eju (Cf. Psalm 23: 1-3; Mark 6: 39-44)
VII. Ọ bụ nɑɑnị nɑ Jesu Kristi kɑ ɑñụrị nɑ ezi nnwereonwe dị: Ọbụrụ nɑ Nwɑ ɑhụ emeee kɑ inwere onwe gị, ị gɑ-enwere onwe gị n’ezie. (Cf. John 8: 31-36)
2*. Gịnị kɑ Kristi tụrụ ɑnyɑ n’ɑkɑ ndị ọ hɑnyere ọrụ nlekọtɑ igwe ɑtụrụ yɑ n’ɑkɑ?