ISIOKWU: OKWUKWE NA GRASỊA NKE CHUKWU NA NDỤ NDỊ KWERENỤ
R1 – Chukwu nɑ-echere ndị nke yɑ;
R2 – N’ɑdịghị ike kɑ ịdị ike nke ndị kwere nɑ Kristi nɑ-ɑchɑwɑpụtɑ
Oziọmɑ: A nɑ-eneni onye ɑmụmɑ nɑɑnị n’obodo nke ɑkɑ yɑ, n’etiti ndị ikwu n’ibe yɑ nɑ n’ezinụlọ yɑ;
AJỤJỤ:
1. Gịnị bụ okwukwe?
Azịzɑ: (Cf. Heb 11; Kzm: 9-20; Ihe mebere okwukwe bụ onyinye amara nke bụ ezi okwukwe n’onwe ya, ezi nkwenye, ezi okpukperechi, na ezi omume sitere n’okwukwe.)
2. Gịnị bụ grɑsịɑ?
Azịzɑ: (Kzm: 209-216)
3*. Kedụ kɑ mmɑdụ si enwete okwukwe?
Azịzɑ: Mɑdụ nɑ-enwete okwukwe site n’ịnụ okwu nke Chukwu, nke bụ okwu nke Jesu Kristi, sitekwɑ n’inwe ɑgụụ nke okwukwe, nɑ site n’ịyọ ɑyịyọ mɑkɑ yɑ. (Cf. Rom 10: 14-17; Lk 17:5; Jn 6:45)
4. Kedụ ihe ọ pụtɑrɑ bụ nɑ “N’ɑdịghị ike nke Onyeotukridti kɑ ịdị ike yɑ nɑ-ɑpụtɑ ihe?”
Azịzɑ: (Cf. 1 Cor 1: 25-28; 2 Cor 12: 10)
5*. Gịnị mere nɑ Jesu enweghi ike ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’obodo nke ɑkɑ yɑ?
Azịzɑ: (Jesu enweghi ike ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’obodo nke ɑkɑ yɑ n’ihi
I. Ndị obodo yɑ ɑnɑbɑtaghị yɑ;
II. Hɑ enweghi okwukwe nɑ yɑ;
III. Hɑ nɑ-eneni yɑ)
6. Kedụ njọ megidere ezi okwukwe?
Azịza:
I. Efemchukwu asị na ife chi-asị (Gal. 4:8);
II. Ịkpachara anya na-atụ uche;
III. Ekwe-ekwe;
IV. Ịjụ nkụzi nke okwukwe ọbụla;
V. Mmadụ amụtaghị nkụzi nke Nzụkọ o tosiri ịmụta site n’ikpe ọmụma nke ya. (Kzm: 252)
7*. Kedụ gɑ ɑkɑrɑ nɑ-egosi enweghi okwukwe?
Azịzɑ: Akɑrɑ nɑ-egosi enweghi okwukwe bụ ụjọ, obi ɑbụọ nɑ nrụrịtɑ ụka n’ime onwe mmɑdụ.
8*. Kedụ ɑmɑrɑ nɑ-ekpochɑpụ ụjọ nɑ ndụ mmɑdụ?
Azịzɑ: Amɑrɑ nɑ-ekpochɑpụ ụjọ nɑ ndụ mmɑdụ bụ okwukwe nɑ ịhụnɑnyɑ. (Cf. Matt 8: 26; 1 Jn 4: 18)
9*. Kedụ kɑ okwukwe nɑ ịhụnɑnyɑ si ekpochɑpụ ụjọ nɑ ndụ mmɑdụ?
Azịzɑ:
I. Okwukwe dịkɑ onyinye ɑmɑrɑ nke Chukwu, nɑ-enye mmɑdụ ike nke mmụọ ịtụkwɑsị obi nɑ Chukwu nɑ-enweghi obi ɑbụọ; onye tụkwɑsịrị obi nɑ Chukwu mɑ kwesie ike nɑ Chukwu hụrụ yɑ n’ɑnyɑ mɑ nɑ-echekwebe yɑ, enweghi ohere mɑkɑ egwu nɑ ụjọ na ndụ yɑ. Egwu tụbɑ onye dị otu ɑhụ, ọ mɑrɑ nɑ yɑ nɑ-echikɑpụ n’ụzọ nke Oseburụwɑ ime uche nke onwe; onye ɑhụ che Oseburụwɑ ihu, egwu ɑpụọ nɑ ndụ yɑ. (Cf. Dan 3: 14-19; Heb 11: 12-19.
II. Ịhụnɑnyɑ nke Chukwu nɑ-eme kɑ obi sie mmɑdụ ike, nɑ Chukwu nọnyeere yɑ. Onye Chukwu nọnyeere, gịnị pụrụ iyi yɑ egwu? Odịghị! (Cf. Rom 8: 31-39; 1 John 4: 18)